N'' inyawa ozi...

4 22
Avatar for Christian_BCH
2 months ago

Biko Ndị b'anyi bụ ndị Igbo niile bị na obodo Naijiria niile, tụọ nụ ntị ụnụ n'ala gụọ gbasara ozi nke m bu Mazi Christian onyema na-enye ụnụ ugbua gbasara ihe mkpesa nke aga-eme na obodo Legos Steti echi niile.

Biko ndị Nne na Nna anyị nke bi na obodo ndị ofe mmanụ niile, ọ kachazị Legos Steti ka ha rịọ ma dụọ ụmụaka ha ndụmọdụ gbasara mkpesa aga-eme echi na obodo ndị ofe mmanụ bụ obodo onye ịsị ala Naijiria sị na ya!

Anam asị ka anyị gbá há nkịtị ka ha mee Nkwugide gbasara agụụ nke na eme há ịwa n'ihi na ọ bụ há kwalitere onye be há kà-ọchia obodo Naijiria ka o were bàrà ha bụ ndị ofe mmanụ!

Ndị Igbo niile kwesịrị icheta ihe mere na Ụtụ okporo ụzọ na- ụbọchị abalị ịrị abụọ na ọnwa nke ịrị na- afọ Puku abụọ na ịrị abụọ na Lekki nke dị na mpaghara Legos steti ebe ha siri na ọ bụ anyị bụ ndị Igbo malitere ya mànà ọ bụghị anyị.

Ha che na ímé itunyere onye be há naanị ka-ọ chia Naijiria na ha ga emegide anyị mana ha amaghị na Chukwu Okike Abịama na-emere onwe ya áhà na-ebe anyị nọ mana site kemgbe ahụ anyị ka ha mma ruo echi.

Ama m na-ihe gbasara igbanwe ego ndị ọcha metụtara anyị niile mana anyị kana abawanye n'ịhị na ọ dịghị anyị ka ihe.

Ọ bụrụ na anyị ga-echeta ihe ha mere ụlọ ndị b'anyi na obodo Legos Steti n'oge gara-aga, anyị ga-aghọta na ndịa-abụghị anyị ga na-emere ọgọ.

Ị lee anya ugbua na ọ ka ha njọ n'ahụ ugbua...

Maka na agụụ na-eme ịwa, arịrịọ karịrị ha na-ahụ ha bụ ndị ofe mmanụ ugbua!

BIKO NDỊ NNE NA NNA ANYỊ DỤỌ NỤ ỤMỤAKA ỤNỤ AKA NA NTỊ...

Àgwà ntị ma ntị anụghị, egbuo ịsị egburu ntị!

Ndewonu...

@Christian_BCH

3
$ 0.00
Avatar for Christian_BCH
2 months ago

Comments

Daalu nnam ukwu. O bu ihe nwute na obodo mu na gi di etua. Obu na okpuisi amaghi akpu, kaobu na aguba adighi nko?. N'ihe ndia niile, anyi bu ndi-Igbo achoghi ima ka ya bu aguu o kpu oku n'onu kaobu mmiri. Isi kota ebu, ogbaa.. ihe m mara buna Chukwuabiama agaghi ekwe ka aguu nweta anyi.. obi dimma ka m si were nweta gi n'ebea. Daalu maka edemedea nwaafo!

$ 0.00
2 months ago

❤️❤️❤️❤️❤️❤️💯

$ 0.00
1 month ago

Great article

$ 0.00
1 month ago

Thanks so much sir

$ 0.00
1 month ago